Aịzaya 30:18
Isaiah 30:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Onyenwe anyị nọkwa na-echere ka unu bịakwute ya, ka o gosi unu ịhụnanya ya. O jikeere imere unu ebere, nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi. Ngọzị na-adịkwara ndị niile na-ele anya inyeaka ya.
Isaiah 30:18 in English
Isaiah 30:18 · Berean Standard Bible
Therefore the LORD longs to be gracious to you; therefore He rises to show you compassion, for the LORD is a just God. Blessed are all who wait for Him.
Context
16Kama unu na-asị, ‘Anyị ga-arịkwasị nʼelu ịnyịnya gbapụ.’
E, unu ga-agba ọsọ nʼezie.
Unu sịrị, ‘Anyị ga-arịkwasị nʼịnyịnya ndị na-efe ọsọ.’
Ya mere, ndị ga-achụ unu ga-adị ngwa. 17Otu onye nʼime ndị iro unu
ga-achụ puku mmadụ nʼime unu ọsọ.
Mmadụ ise si nʼime ha
ezuola ịchusasị unu,
ruo mgbe unu ga-adị
ka osisi a manyere ọkọlọtọ debe nʼelu ugwu,
e, ka ọkọlọtọ a hapụrụ nʼelu ugwu nta.” 18Ma Onyenwe anyị nọkwa na-echere ka unu bịakwute ya,
ka o gosi unu ịhụnanya ya.
O jikeere imere unu ebere, nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi.
Ngọzị na-adịkwara ndị niile na-ele anya inyeaka ya. 19Unu ndị Zayọn ndị bi na Jerusalem, ndị nke m, unu agaghị ebekwa akwa ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye obi ebere. Ọ ga-enyere unu aka mgbe ọbụla unu kpọkuru ya. 20Nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị na-enye unu achịcha nke nhụju anya na mmiri nke ahụhụ, ndị ozizi unu agaghị abụkwa ndị zoro onwe ha ọzọ, kama unu ga-eji anya unu hụ ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.