Aịzaya 30:19
Isaiah 30:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu ndị Zayọn ndị bi na Jerusalem, ndị nke m, unu agaghị ebekwa akwa ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye obi ebere. Ọ ga-enyere unu aka mgbe ọbụla unu kpọkuru ya.
Isaiah 30:19 in English
Isaiah 30:19 · Berean Standard Bible
O people in Zion who dwell in Jerusalem, you will weep no more. He will surely be gracious when you cry for help; when He hears, He will answer you.
Context
17Otu onye nʼime ndị iro unu
ga-achụ puku mmadụ nʼime unu ọsọ.
Mmadụ ise si nʼime ha
ezuola ịchusasị unu,
ruo mgbe unu ga-adị
ka osisi a manyere ọkọlọtọ debe nʼelu ugwu,
e, ka ọkọlọtọ a hapụrụ nʼelu ugwu nta.” 18Ma Onyenwe anyị nọkwa na-echere ka unu bịakwute ya,
ka o gosi unu ịhụnanya ya.
O jikeere imere unu ebere, nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi.
Ngọzị na-adịkwara ndị niile na-ele anya inyeaka ya. 19Unu ndị Zayọn ndị bi na Jerusalem, ndị nke m, unu agaghị ebekwa akwa ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye obi ebere. Ọ ga-enyere unu aka mgbe ọbụla unu kpọkuru ya. 20Nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị na-enye unu achịcha nke nhụju anya na mmiri nke ahụhụ, ndị ozizi unu agaghị abụkwa ndị zoro onwe ha ọzọ, kama unu ga-eji anya unu hụ ha. 21Ma unu tụgharịrị nʼaka nri ma ọ bụkwanụ nʼaka ekpe, ntị unu ga-anụ otu olu nʼazụ unu, nke na-asị, “Nke a bụ ụzọ, Jeenụ ije nʼime ya.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.