Aịzaya 30:16
Isaiah 30:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Kama unu na-asị, ‘Anyị ga-arịkwasị nʼelu ịnyịnya gbapụ.’ E, unu ga-agba ọsọ nʼezie. Unu sịrị, ‘Anyị ga-arịkwasị nʼịnyịnya ndị na-efe ọsọ.’ Ya mere, ndị ga-achụ unu ga-adị ngwa.
Isaiah 30:16 in English
Isaiah 30:16 · Berean Standard Bible
“No,” you say, “we will flee on horses.” Therefore you will flee! “We will ride swift horses,” but your pursuers will be faster.
Context
14Ọ ga-etipịasị dịka ite aja,
nke etipịara na-enweghị obi ebere,
nke a na-enweghị ike ịchọta mpekele ejuju ọbụla nʼetiti ya,
iji gụta ọkụ site na-ekwu,
maọbụ kupụta mmiri site nʼite.” 15Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ Onye nsọ nke Izrel sịrị,
“Ọ bụ na nchegharị na izuike ka a ga-azọpụta unu,
na ịnọ juu na ntụkwasị obi ka ịdị ike unu ga-adị,
ma unu ekweghị na nke ọbụla. 16Kama unu na-asị, ‘Anyị ga-arịkwasị nʼelu ịnyịnya gbapụ.’
E, unu ga-agba ọsọ nʼezie.
Unu sịrị, ‘Anyị ga-arịkwasị nʼịnyịnya ndị na-efe ọsọ.’
Ya mere, ndị ga-achụ unu ga-adị ngwa. 17Otu onye nʼime ndị iro unu
ga-achụ puku mmadụ nʼime unu ọsọ.
Mmadụ ise si nʼime ha
ezuola ịchusasị unu,
ruo mgbe unu ga-adị
ka osisi a manyere ọkọlọtọ debe nʼelu ugwu,
e, ka ọkọlọtọ a hapụrụ nʼelu ugwu nta.” 18Ma Onyenwe anyị nọkwa na-echere ka unu bịakwute ya,
ka o gosi unu ịhụnanya ya.
O jikeere imere unu ebere, nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi.
Ngọzị na-adịkwara ndị niile na-ele anya inyeaka ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.