Aịzaya 30:15
Isaiah 30:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ Onye nsọ nke Izrel sịrị, “Ọ bụ na nchegharị na izuike ka a ga-azọpụta unu, na ịnọ juu na ntụkwasị obi ka ịdị ike unu ga-adị, ma unu ekweghị na nke ọbụla.
Isaiah 30:15 in English
Isaiah 30:15 · Berean Standard Bible
For the Lord GOD, the Holy One of Israel, has said: “By repentance and rest you would be saved; your strength would lie in quiet confidence— but you were not willing.”
Context
13mmehie a ga-aghọrọ unu
ihe dịka mgbidi dị elu, nke gbawara agbawa,
nke ga-ada na mberede, nʼotu ntabi anya. 14Ọ ga-etipịasị dịka ite aja,
nke etipịara na-enweghị obi ebere,
nke a na-enweghị ike ịchọta mpekele ejuju ọbụla nʼetiti ya,
iji gụta ọkụ site na-ekwu,
maọbụ kupụta mmiri site nʼite.” 15Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ Onye nsọ nke Izrel sịrị,
“Ọ bụ na nchegharị na izuike ka a ga-azọpụta unu,
na ịnọ juu na ntụkwasị obi ka ịdị ike unu ga-adị,
ma unu ekweghị na nke ọbụla. 16Kama unu na-asị, ‘Anyị ga-arịkwasị nʼelu ịnyịnya gbapụ.’
E, unu ga-agba ọsọ nʼezie.
Unu sịrị, ‘Anyị ga-arịkwasị nʼịnyịnya ndị na-efe ọsọ.’
Ya mere, ndị ga-achụ unu ga-adị ngwa. 17Otu onye nʼime ndị iro unu
ga-achụ puku mmadụ nʼime unu ọsọ.
Mmadụ ise si nʼime ha
ezuola ịchusasị unu,
ruo mgbe unu ga-adị
ka osisi a manyere ọkọlọtọ debe nʼelu ugwu,
e, ka ọkọlọtọ a hapụrụ nʼelu ugwu nta.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.