Aịzaya 30:13
Isaiah 30:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
mmehie a ga-aghọrọ unu ihe dịka mgbidi dị elu, nke gbawara agbawa, nke ga-ada na mberede, nʼotu ntabi anya.
Isaiah 30:13 in English
Isaiah 30:13 · Berean Standard Bible
this iniquity of yours is like a breach about to fail, a bulge in a high wall, whose collapse will come suddenly— in an instant!
Context
11Unu na-anọchiri anyị ụzọ,
nyenụ anyị ohere.
Anyị achọkwaghị ịnụ ihe ọbụla
banyere onye ahụ unu na-akpọ Onye dị nsọ nke Izrel.” 12Ya mere, ihe a ka Onye dị nsọ nke Izrel na-ekwu,
“Nʼihi na unu kpọrọ okwu m na-agwa unu asị,
ma dabere na mmegbu
na-atụkwasịkwa obi unu nʼaghụghọ, 13mmehie a ga-aghọrọ unu
ihe dịka mgbidi dị elu, nke gbawara agbawa,
nke ga-ada na mberede, nʼotu ntabi anya. 14Ọ ga-etipịasị dịka ite aja,
nke etipịara na-enweghị obi ebere,
nke a na-enweghị ike ịchọta mpekele ejuju ọbụla nʼetiti ya,
iji gụta ọkụ site na-ekwu,
maọbụ kupụta mmiri site nʼite.” 15Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ Onye nsọ nke Izrel sịrị,
“Ọ bụ na nchegharị na izuike ka a ga-azọpụta unu,
na ịnọ juu na ntụkwasị obi ka ịdị ike unu ga-adị,
ma unu ekweghị na nke ọbụla.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.