Aịzaya 30:11
Isaiah 30:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu na-anọchiri anyị ụzọ, nyenụ anyị ohere. Anyị achọkwaghị ịnụ ihe ọbụla banyere onye ahụ unu na-akpọ Onye dị nsọ nke Izrel.”
Isaiah 30:11 in English
Isaiah 30:11 · Berean Standard Bible
Get out of the way; turn off the road. Rid us of the Holy One of Israel!”
Context
9Nʼihi na ndị a bụ ndị na-enupu isi, ụmụ aghụghọ
ndị kpachaara anya jụ ịnabata ozizi Onyenwe anyị na-ezi. 10Ha na-agwa ndị ọhụ ụzọ,
“Unu ahụkwala ọhụ, o zuola,”
ma sịkwa ndị amụma,
“Mechienụ ọnụ! Unu ahụtakwarala anyị ihe ziri ezi nʼọhụ unu.
Gwanụ anyị ihe na-atọ ụtọ na ntị,
buonu amụma nduhie. 11Unu na-anọchiri anyị ụzọ,
nyenụ anyị ohere.
Anyị achọkwaghị ịnụ ihe ọbụla
banyere onye ahụ unu na-akpọ Onye dị nsọ nke Izrel.” 12Ya mere, ihe a ka Onye dị nsọ nke Izrel na-ekwu,
“Nʼihi na unu kpọrọ okwu m na-agwa unu asị,
ma dabere na mmegbu
na-atụkwasịkwa obi unu nʼaghụghọ, 13mmehie a ga-aghọrọ unu
ihe dịka mgbidi dị elu, nke gbawara agbawa,
nke ga-ada na mberede, nʼotu ntabi anya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.