Aịzaya 30:9
Isaiah 30:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ndị a bụ ndị na-enupu isi, ụmụ aghụghọ ndị kpachaara anya jụ ịnabata ozizi Onyenwe anyị na-ezi.
Isaiah 30:9 in English
Isaiah 30:9 · Berean Standard Bible
These are rebellious people, deceitful children, children unwilling to obey the LORD’s instruction.
Context
7bụ Ijipt, ndị inyeaka ha na-enye enweghị isi.
Nʼihi nke a, ana m agụ ya
Rehab, onye na-enweghị ihe ọ na-arụ. 8Gaa ugbu a, dekwasịrị ha ya nʼelu mbadamba nkume,
detuokwa ha nʼime akwụkwọ,
ka ọ dịrị maka ụbọchị na-abịa
dịka ihe akaebe ruo mgbe ebighị ebi. 9Nʼihi na ndị a bụ ndị na-enupu isi, ụmụ aghụghọ
ndị kpachaara anya jụ ịnabata ozizi Onyenwe anyị na-ezi. 10Ha na-agwa ndị ọhụ ụzọ,
“Unu ahụkwala ọhụ, o zuola,”
ma sịkwa ndị amụma,
“Mechienụ ọnụ! Unu ahụtakwarala anyị ihe ziri ezi nʼọhụ unu.
Gwanụ anyị ihe na-atọ ụtọ na ntị,
buonu amụma nduhie. 11Unu na-anọchiri anyị ụzọ,
nyenụ anyị ohere.
Anyị achọkwaghị ịnụ ihe ọbụla
banyere onye ahụ unu na-akpọ Onye dị nsọ nke Izrel.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.