Aịzaya 30:7
Isaiah 30:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
bụ Ijipt, ndị inyeaka ha na-enye enweghị isi. Nʼihi nke a, ana m agụ ya Rehab, onye na-enweghị ihe ọ na-arụ.
Isaiah 30:7 in English
Isaiah 30:7 · Berean Standard Bible
Egypt’s help is futile and empty; therefore I have called her Rahab Who Sits Still.*
Context
5ihere ga-eme onye ọbụla
nʼihi ndị na-abaghị uru nye ha,
ndị na-abụghị ihe inyeaka maọbụ ihe iba uru,
kama naanị ihe ihere na ịta ụta.” 6Amụma banyere ụmụ anụmanụ bi na Negev.
Nʼala ahụhụ na mkpagbu,
nke ọdụm na nne ọdụm,
nke ajụala na agwọ ọjọọ na-efe ka ọkụ,
ndị nnọchite anya obodo na-ebu akụ ha niile nʼelu ịnyịnya ibu,
na-ebukwa akụnụba ha dị oke ọnụahịa nʼelu ịnyịnya kamel,
na-agakwuru mba ahụ na-abaghị uru, 7bụ Ijipt, ndị inyeaka ha na-enye enweghị isi.
Nʼihi nke a, ana m agụ ya
Rehab, onye na-enweghị ihe ọ na-arụ. 8Gaa ugbu a, dekwasịrị ha ya nʼelu mbadamba nkume,
detuokwa ha nʼime akwụkwọ,
ka ọ dịrị maka ụbọchị na-abịa
dịka ihe akaebe ruo mgbe ebighị ebi. 9Nʼihi na ndị a bụ ndị na-enupu isi, ụmụ aghụghọ
ndị kpachaara anya jụ ịnabata ozizi Onyenwe anyị na-ezi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.