Aịzaya 30:8
Isaiah 30:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gaa ugbu a, dekwasịrị ha ya nʼelu mbadamba nkume, detuokwa ha nʼime akwụkwọ, ka ọ dịrị maka ụbọchị na-abịa dịka ihe akaebe ruo mgbe ebighị ebi.
Isaiah 30:8 in English
Isaiah 30:8 · Berean Standard Bible
Go now, write it on a tablet in their presence and inscribe it on a scroll; it will be for the days to come, a witness forever and ever.
Context
6Amụma banyere ụmụ anụmanụ bi na Negev.
Nʼala ahụhụ na mkpagbu,
nke ọdụm na nne ọdụm,
nke ajụala na agwọ ọjọọ na-efe ka ọkụ,
ndị nnọchite anya obodo na-ebu akụ ha niile nʼelu ịnyịnya ibu,
na-ebukwa akụnụba ha dị oke ọnụahịa nʼelu ịnyịnya kamel,
na-agakwuru mba ahụ na-abaghị uru, 7bụ Ijipt, ndị inyeaka ha na-enye enweghị isi.
Nʼihi nke a, ana m agụ ya
Rehab, onye na-enweghị ihe ọ na-arụ. 8Gaa ugbu a, dekwasịrị ha ya nʼelu mbadamba nkume,
detuokwa ha nʼime akwụkwọ,
ka ọ dịrị maka ụbọchị na-abịa
dịka ihe akaebe ruo mgbe ebighị ebi. 9Nʼihi na ndị a bụ ndị na-enupu isi, ụmụ aghụghọ
ndị kpachaara anya jụ ịnabata ozizi Onyenwe anyị na-ezi. 10Ha na-agwa ndị ọhụ ụzọ,
“Unu ahụkwala ọhụ, o zuola,”
ma sịkwa ndị amụma,
“Mechienụ ọnụ! Unu ahụtakwarala anyị ihe ziri ezi nʼọhụ unu.
Gwanụ anyị ihe na-atọ ụtọ na ntị,
buonu amụma nduhie.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.