Aịzaya 30:14
Isaiah 30:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ ga-etipịasị dịka ite aja, nke etipịara na-enweghị obi ebere, nke a na-enweghị ike ịchọta mpekele ejuju ọbụla nʼetiti ya, iji gụta ọkụ site na-ekwu, maọbụ kupụta mmiri site nʼite.”
Isaiah 30:14 in English
Isaiah 30:14 · Berean Standard Bible
It will break in pieces like a potter’s jar, shattered so that no fragment can be found. Not a shard will be found in the dust large enough to scoop the coals from a hearth or to skim the water from a cistern.”
Context
12Ya mere, ihe a ka Onye dị nsọ nke Izrel na-ekwu,
“Nʼihi na unu kpọrọ okwu m na-agwa unu asị,
ma dabere na mmegbu
na-atụkwasịkwa obi unu nʼaghụghọ, 13mmehie a ga-aghọrọ unu
ihe dịka mgbidi dị elu, nke gbawara agbawa,
nke ga-ada na mberede, nʼotu ntabi anya. 14Ọ ga-etipịasị dịka ite aja,
nke etipịara na-enweghị obi ebere,
nke a na-enweghị ike ịchọta mpekele ejuju ọbụla nʼetiti ya,
iji gụta ọkụ site na-ekwu,
maọbụ kupụta mmiri site nʼite.” 15Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ Onye nsọ nke Izrel sịrị,
“Ọ bụ na nchegharị na izuike ka a ga-azọpụta unu,
na ịnọ juu na ntụkwasị obi ka ịdị ike unu ga-adị,
ma unu ekweghị na nke ọbụla. 16Kama unu na-asị, ‘Anyị ga-arịkwasị nʼelu ịnyịnya gbapụ.’
E, unu ga-agba ọsọ nʼezie.
Unu sịrị, ‘Anyị ga-arịkwasị nʼịnyịnya ndị na-efe ọsọ.’
Ya mere, ndị ga-achụ unu ga-adị ngwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.