Aịzaya 3:18
Isaiah 3:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-anapụ ha ihe ịchọ mma ha niile, ma mgbaaka, ma ịchafọ ịgbado isi, ma ihe olu nke dị nʼụdịdị ọnwa ọhụrụ,
Isaiah 3:18 in English
Isaiah 3:18 · Berean Standard Bible
In that day the Lord will take away their finery: their anklets and headbands and crescents;
Context
16Ọzọkwa, Onyenwe anyị kwuru sị,
“Ndị inyom Zayọn bụ ndị mpako.
Ha ji olu e setịrị eseti,
na anya na-achọgharị ndị ikom ha ga-aghọgbuta na-ejegharị.
Ha na-ejegharịkwa na-arọ mma na-aṅagharịkwa ukwu,
na-emekwa ka ihe ịchọ mma ọla ụkwụ ha na-ada ụda. 17Nʼihi ya, Onyenwe anyị ga-eme ka ọnya jupụta nʼisi ndị inyom Zayọn,
Onyenwe anyị ga-emekwa ka ha gharakwa inwe agịrị isi nʼisi ha.” 18Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-anapụ ha ihe ịchọ mma ha niile, ma mgbaaka, ma ịchafọ ịgbado isi, ma ihe olu nke dị nʼụdịdị ọnwa ọhụrụ, 19ma ọlantị, ma mgbaaka, ma akwa e ji ekpuchi ihu, 20ma akwa ha na-eyi nʼisi, na ọla ụkwụ, ma ihe ha na-eke nʼukwu, ma karama mmanụ isi ụtọ, ma ọgwụ dị iche iche;
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.