Aịzaya 3:17
Isaiah 3:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ya, Onyenwe anyị ga-eme ka ọnya jupụta nʼisi ndị inyom Zayọn, Onyenwe anyị ga-emekwa ka ha gharakwa inwe agịrị isi nʼisi ha.”
Isaiah 3:17 in English
Isaiah 3:17 · Berean Standard Bible
the Lord will bring sores on the heads of the daughters of Zion, and the LORD will make their foreheads bare.*”
Context
15Gịnị mere unu ji azọpịa ndị m,
“Gịnị mere unu ji si otu a na-egwepịa ihu ndị ogbenye?”
Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara. 16Ọzọkwa, Onyenwe anyị kwuru sị,
“Ndị inyom Zayọn bụ ndị mpako.
Ha ji olu e setịrị eseti,
na anya na-achọgharị ndị ikom ha ga-aghọgbuta na-ejegharị.
Ha na-ejegharịkwa na-arọ mma na-aṅagharịkwa ukwu,
na-emekwa ka ihe ịchọ mma ọla ụkwụ ha na-ada ụda. 17Nʼihi ya, Onyenwe anyị ga-eme ka ọnya jupụta nʼisi ndị inyom Zayọn,
Onyenwe anyị ga-emekwa ka ha gharakwa inwe agịrị isi nʼisi ha.” 18Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-anapụ ha ihe ịchọ mma ha niile, ma mgbaaka, ma ịchafọ ịgbado isi, ma ihe olu nke dị nʼụdịdị ọnwa ọhụrụ, 19ma ọlantị, ma mgbaaka, ma akwa e ji ekpuchi ihu,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.