Aịzaya 3:15
Isaiah 3:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gịnị mere unu ji azọpịa ndị m, “Gịnị mere unu ji si otu a na-egwepịa ihu ndị ogbenye?” Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara.
Isaiah 3:15 in English
Isaiah 3:15 · Berean Standard Bible
Why do you crush My people and grind the faces of the poor?” declares the Lord GOD of Hosts.
Context
13Onyenwe anyị anyị ewerela ọnọdụ ya nʼụlọikpe;
ọ na-eguzo ikpe ndị ya niile ikpe. 14Onyenwe anyị na-aba nʼikpe
megide ndị okenye na ndị ndu nke ndị ya niile.*
Ọ bụ unu bụ ndị lara ubi vaịnị m nʼiyi;
ihe unu ji aka ike pụnara ndị ogbenye jupụtara nʼụlọ unu. 15Gịnị mere unu ji azọpịa ndị m,
“Gịnị mere unu ji si otu a na-egwepịa ihu ndị ogbenye?”
Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara. 16Ọzọkwa, Onyenwe anyị kwuru sị,
“Ndị inyom Zayọn bụ ndị mpako.
Ha ji olu e setịrị eseti,
na anya na-achọgharị ndị ikom ha ga-aghọgbuta na-ejegharị.
Ha na-ejegharịkwa na-arọ mma na-aṅagharịkwa ukwu,
na-emekwa ka ihe ịchọ mma ọla ụkwụ ha na-ada ụda. 17Nʼihi ya, Onyenwe anyị ga-eme ka ọnya jupụta nʼisi ndị inyom Zayọn,
Onyenwe anyị ga-emekwa ka ha gharakwa inwe agịrị isi nʼisi ha.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.