Aịzaya 3:16
Isaiah 3:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọzọkwa, Onyenwe anyị kwuru sị, “Ndị inyom Zayọn bụ ndị mpako. Ha ji olu e setịrị eseti, na anya na-achọgharị ndị ikom ha ga-aghọgbuta na-ejegharị. Ha na-ejegharịkwa na-arọ mma na-aṅagharịkwa ukwu, na-emekwa ka ihe ịchọ mma ọla ụkwụ ha na-ada ụda.
Isaiah 3:16 in English
Isaiah 3:16 · Berean Standard Bible
The LORD also says: “Because the daughters of Zion are haughty— walking with heads held high and wanton eyes, prancing and skipping as they go, jingling the bracelets on their ankles—
Context
14Onyenwe anyị na-aba nʼikpe
megide ndị okenye na ndị ndu nke ndị ya niile.*
Ọ bụ unu bụ ndị lara ubi vaịnị m nʼiyi;
ihe unu ji aka ike pụnara ndị ogbenye jupụtara nʼụlọ unu. 15Gịnị mere unu ji azọpịa ndị m,
“Gịnị mere unu ji si otu a na-egwepịa ihu ndị ogbenye?”
Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara. 16Ọzọkwa, Onyenwe anyị kwuru sị,
“Ndị inyom Zayọn bụ ndị mpako.
Ha ji olu e setịrị eseti,
na anya na-achọgharị ndị ikom ha ga-aghọgbuta na-ejegharị.
Ha na-ejegharịkwa na-arọ mma na-aṅagharịkwa ukwu,
na-emekwa ka ihe ịchọ mma ọla ụkwụ ha na-ada ụda. 17Nʼihi ya, Onyenwe anyị ga-eme ka ọnya jupụta nʼisi ndị inyom Zayọn,
Onyenwe anyị ga-emekwa ka ha gharakwa inwe agịrị isi nʼisi ha.” 18Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-anapụ ha ihe ịchọ mma ha niile, ma mgbaaka, ma ịchafọ ịgbado isi, ma ihe olu nke dị nʼụdịdị ọnwa ọhụrụ,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.