Aịzaya 3:14
Isaiah 3:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị na-aba nʼikpe megide ndị okenye na ndị ndu nke ndị ya niile.* Ọ bụ unu bụ ndị lara ubi vaịnị m nʼiyi; ihe unu ji aka ike pụnara ndị ogbenye jupụtara nʼụlọ unu.
Isaiah 3:14 in English
Isaiah 3:14 · Berean Standard Bible
The LORD brings this charge against the elders and leaders of His people: “You have devoured the vineyard; the plunder of the poor is in your houses.
Context
12Ụmụ okorobịa na-emegbu ndị m,
ụmụ nwanyị na-achịkwa ha.
Ndị m, lee na ndị na-achị unu na-eduhie unu ụzọ.
Ha na-eme ka unu kpafuo; ha esitela nʼezi ụzọ wezuga unu. 13Onyenwe anyị anyị ewerela ọnọdụ ya nʼụlọikpe;
ọ na-eguzo ikpe ndị ya niile ikpe. 14Onyenwe anyị na-aba nʼikpe
megide ndị okenye na ndị ndu nke ndị ya niile.*
Ọ bụ unu bụ ndị lara ubi vaịnị m nʼiyi;
ihe unu ji aka ike pụnara ndị ogbenye jupụtara nʼụlọ unu. 15Gịnị mere unu ji azọpịa ndị m,
“Gịnị mere unu ji si otu a na-egwepịa ihu ndị ogbenye?”
Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara. 16Ọzọkwa, Onyenwe anyị kwuru sị,
“Ndị inyom Zayọn bụ ndị mpako.
Ha ji olu e setịrị eseti,
na anya na-achọgharị ndị ikom ha ga-aghọgbuta na-ejegharị.
Ha na-ejegharịkwa na-arọ mma na-aṅagharịkwa ukwu,
na-emekwa ka ihe ịchọ mma ọla ụkwụ ha na-ada ụda.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.