Aịzaya 27:6
Isaiah 27:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụbọchị ndị na-abịa, Jekọb ga-agba mgbọrọgwụ. Izrel ga-agbawa okoko dịka osisi, maakwa ifuru, jirikwa mkpụrụ mejupụta ụwa niile.
Isaiah 27:6 in English
Isaiah 27:6 · Berean Standard Bible
In the days to come, Jacob will take root. Israel will bud and blossom and fill the whole world with fruit.
Context
4Adịghị m ewekwa iwe.
Ọ bụrụ na ọ bụ naanị ogwu na uke na-echere m aka mgba,
aga m ebili buso ha agha,
aga m esurekwa ha ọkụ. 5Ma ọ bụghị otu a, ka ha bịakwute m maka nchekwa,
ha bịa ka mụ na ha mee udo.
E, ha bịa ka mụ na ha mee udo.” 6Nʼụbọchị ndị na-abịa, Jekọb ga-agba mgbọrọgwụ.
Izrel ga-agbawa okoko dịka osisi, maakwa ifuru,
jirikwa mkpụrụ mejupụta ụwa niile. 7Onyenwe anyị atabeghị Izrel ahụhụ
dịka o si taa ndị iro ya.
O mebekwaghị ka e gbuo ndị ya
dị ka e si gbuo ndị iro ha. 8Onyenwe anyị tara ndị ya ahụhụ, mee ka a dọrọ ha nʼagha ma buru ha gaa mba ọzọ.
Ọ bụ ifufe ọjọọ nke si nʼọwụwa anyanwụ
ka o ji bupụ ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.