Aịzaya 27:5
Isaiah 27:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ọ bụghị otu a, ka ha bịakwute m maka nchekwa, ha bịa ka mụ na ha mee udo. E, ha bịa ka mụ na ha mee udo.”
Isaiah 27:5 in English
Isaiah 27:5 · Berean Standard Bible
Or let them lay claim to My protection; let them make peace with Me— yes, let them make peace with Me.”
Context
3“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-elekọta ya,
ana m agba ya mmiri ụbọchị niile,
na-eche ya nche ehihie na abalị.
Ka onye ọbụla ghara iji ihe ọjọọ leta ya. 4Adịghị m ewekwa iwe.
Ọ bụrụ na ọ bụ naanị ogwu na uke na-echere m aka mgba,
aga m ebili buso ha agha,
aga m esurekwa ha ọkụ. 5Ma ọ bụghị otu a, ka ha bịakwute m maka nchekwa,
ha bịa ka mụ na ha mee udo.
E, ha bịa ka mụ na ha mee udo.” 6Nʼụbọchị ndị na-abịa, Jekọb ga-agba mgbọrọgwụ.
Izrel ga-agbawa okoko dịka osisi, maakwa ifuru,
jirikwa mkpụrụ mejupụta ụwa niile. 7Onyenwe anyị atabeghị Izrel ahụhụ
dịka o si taa ndị iro ya.
O mebekwaghị ka e gbuo ndị ya
dị ka e si gbuo ndị iro ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.