Aịzaya 27:3
Isaiah 27:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-elekọta ya, ana m agba ya mmiri ụbọchị niile, na-eche ya nche ehihie na abalị. Ka onye ọbụla ghara iji ihe ọjọọ leta ya.
Isaiah 27:3 in English
Isaiah 27:3 · Berean Standard Bible
I, the LORD, am its keeper; I water it continually. I guard it night and day so no one can disturb it;
Context
1Nʼụbọchị ahụ,
Onyenwe anyị ga-eji mma agha ya
iwe ya, dị ukwuu dịkwa ezigbo ike,
taa agwọ ahụ na-akpụ akpụ bụ Leviatan ahụhụ.
Leviatan bụ agwọ mgbakọ ahụ;
ọ ga-egbukwa nnukwu anụ ọjọọ ahụ nke bi na mmiri. 2Nʼụbọchị ahụ,
abụ a ga-adị nʼọnụ ha, abụ ha ga-abụ banyere ubi vaịnị nke na-amị ezi mkpụrụ. 3“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-elekọta ya,
ana m agba ya mmiri ụbọchị niile,
na-eche ya nche ehihie na abalị.
Ka onye ọbụla ghara iji ihe ọjọọ leta ya. 4Adịghị m ewekwa iwe.
Ọ bụrụ na ọ bụ naanị ogwu na uke na-echere m aka mgba,
aga m ebili buso ha agha,
aga m esurekwa ha ọkụ. 5Ma ọ bụghị otu a, ka ha bịakwute m maka nchekwa,
ha bịa ka mụ na ha mee udo.
E, ha bịa ka mụ na ha mee udo.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.