Aịzaya 27:2
Isaiah 27:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụbọchị ahụ, abụ a ga-adị nʼọnụ ha, abụ ha ga-abụ banyere ubi vaịnị nke na-amị ezi mkpụrụ.
Isaiah 27:2 in English
Isaiah 27:2 · Berean Standard Bible
In that day: “Sing about a fruitful vineyard.
Context
1Nʼụbọchị ahụ,
Onyenwe anyị ga-eji mma agha ya
iwe ya, dị ukwuu dịkwa ezigbo ike,
taa agwọ ahụ na-akpụ akpụ bụ Leviatan ahụhụ.
Leviatan bụ agwọ mgbakọ ahụ;
ọ ga-egbukwa nnukwu anụ ọjọọ ahụ nke bi na mmiri. 2Nʼụbọchị ahụ,
abụ a ga-adị nʼọnụ ha, abụ ha ga-abụ banyere ubi vaịnị nke na-amị ezi mkpụrụ. 3“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-elekọta ya,
ana m agba ya mmiri ụbọchị niile,
na-eche ya nche ehihie na abalị.
Ka onye ọbụla ghara iji ihe ọjọọ leta ya. 4Adịghị m ewekwa iwe.
Ọ bụrụ na ọ bụ naanị ogwu na uke na-echere m aka mgba,
aga m ebili buso ha agha,
aga m esurekwa ha ọkụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.