Aịzaya 27:1
Isaiah 27:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-eji mma agha ya iwe ya, dị ukwuu dịkwa ezigbo ike, taa agwọ ahụ na-akpụ akpụ bụ Leviatan ahụhụ. Leviatan bụ agwọ mgbakọ ahụ; ọ ga-egbukwa nnukwu anụ ọjọọ ahụ nke bi na mmiri.
Isaiah 27:1 in English
Isaiah 27:1 · Berean Standard Bible
In that day the LORD will take His sharp, great, and mighty sword, and bring judgment on Leviathan the fleeing serpent *—Leviathan the coiling serpent—and He will slay the dragon of the sea.
Context
1Nʼụbọchị ahụ,
Onyenwe anyị ga-eji mma agha ya
iwe ya, dị ukwuu dịkwa ezigbo ike,
taa agwọ ahụ na-akpụ akpụ bụ Leviatan ahụhụ.
Leviatan bụ agwọ mgbakọ ahụ;
ọ ga-egbukwa nnukwu anụ ọjọọ ahụ nke bi na mmiri. 2Nʼụbọchị ahụ,
abụ a ga-adị nʼọnụ ha, abụ ha ga-abụ banyere ubi vaịnị nke na-amị ezi mkpụrụ. 3“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-elekọta ya,
ana m agba ya mmiri ụbọchị niile,
na-eche ya nche ehihie na abalị.
Ka onye ọbụla ghara iji ihe ọjọọ leta ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.