Aịzaya 27:7
Isaiah 27:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị atabeghị Izrel ahụhụ dịka o si taa ndị iro ya. O mebekwaghị ka e gbuo ndị ya dị ka e si gbuo ndị iro ha.
Isaiah 27:7 in English
Isaiah 27:7 · Berean Standard Bible
Has the LORD struck Israel as He struck her oppressors? Was she killed like those who slayed her?
Context
5Ma ọ bụghị otu a, ka ha bịakwute m maka nchekwa,
ha bịa ka mụ na ha mee udo.
E, ha bịa ka mụ na ha mee udo.” 6Nʼụbọchị ndị na-abịa, Jekọb ga-agba mgbọrọgwụ.
Izrel ga-agbawa okoko dịka osisi, maakwa ifuru,
jirikwa mkpụrụ mejupụta ụwa niile. 7Onyenwe anyị atabeghị Izrel ahụhụ
dịka o si taa ndị iro ya.
O mebekwaghị ka e gbuo ndị ya
dị ka e si gbuo ndị iro ha. 8Onyenwe anyị tara ndị ya ahụhụ, mee ka a dọrọ ha nʼagha ma buru ha gaa mba ọzọ.
Ọ bụ ifufe ọjọọ nke si nʼọwụwa anyanwụ
ka o ji bupụ ha. 9Ọ bụ nʼụzọ dị otu a ka a ga-esi bupụ ikpe ọmụma dịrị Jekọb,
nke a bụkwa iju eju nke mkpụrụ e ji wezuga mmehie ya:
Mgbe ha gweriri nkume niile ha ji wuo ebe ịchụ aja arụsị ha
dịka ntụ,
mgbe ha wezugara ogidi arụsị Ashera,
na ebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.