Native Bible

Isaiah 27:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị tara ndị ya ahụhụ, mee ka a dọrọ ha nʼagha ma buru ha gaa mba ọzọ. Ọ bụ ifufe ọjọọ nke si nʼọwụwa anyanwụ ka o ji bupụ ha.

Isaiah 27:8 in English

Isaiah 27:8 · Berean Standard Bible

By warfare and exile * You contended with her and removed her with a fierce wind, as on the day the east wind blows.

Context

6Nʼụbọchị ndị na-abịa, Jekọb ga-agba mgbọrọgwụ. Izrel ga-agbawa okoko dịka osisi, maakwa ifuru, jirikwa mkpụrụ mejupụta ụwa niile. 7Onyenwe anyị atabeghị Izrel ahụhụ dịka o si taa ndị iro ya. O mebekwaghị ka e gbuo ndị ya dị ka e si gbuo ndị iro ha. 8Onyenwe anyị tara ndị ya ahụhụ, mee ka a dọrọ ha nʼagha ma buru ha gaa mba ọzọ. Ọ bụ ifufe ọjọọ nke si nʼọwụwa anyanwụ ka o ji bupụ ha. 9Ọ bụ nʼụzọ dị otu a ka a ga-esi bupụ ikpe ọmụma dịrị Jekọb, nke a bụkwa iju eju nke mkpụrụ e ji wezuga mmehie ya: Mgbe ha gweriri nkume niile ha ji wuo ebe ịchụ aja arụsị ha dịka ntụ, mgbe ha wezugara ogidi arụsị Ashera, na ebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ niile. 10Obodo ahụ e wusiri ike adakpọsịala. Ọ ghọọla ọzara nke ndị mmadụ na-ebighị nʼime ya. Ọ ghọọkwala ebe ụmụ ehi na-akpa nri, ebe ha na-amakpu na-ezu ike. Ha ga-atacha ahịhịa dị nʼalaka osisi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.