Aịzaya 27:8
Isaiah 27:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị tara ndị ya ahụhụ, mee ka a dọrọ ha nʼagha ma buru ha gaa mba ọzọ. Ọ bụ ifufe ọjọọ nke si nʼọwụwa anyanwụ ka o ji bupụ ha.
Isaiah 27:8 in English
Isaiah 27:8 · Berean Standard Bible
By warfare and exile * You contended with her and removed her with a fierce wind, as on the day the east wind blows.
Context
6Nʼụbọchị ndị na-abịa, Jekọb ga-agba mgbọrọgwụ.
Izrel ga-agbawa okoko dịka osisi, maakwa ifuru,
jirikwa mkpụrụ mejupụta ụwa niile. 7Onyenwe anyị atabeghị Izrel ahụhụ
dịka o si taa ndị iro ya.
O mebekwaghị ka e gbuo ndị ya
dị ka e si gbuo ndị iro ha. 8Onyenwe anyị tara ndị ya ahụhụ, mee ka a dọrọ ha nʼagha ma buru ha gaa mba ọzọ.
Ọ bụ ifufe ọjọọ nke si nʼọwụwa anyanwụ
ka o ji bupụ ha. 9Ọ bụ nʼụzọ dị otu a ka a ga-esi bupụ ikpe ọmụma dịrị Jekọb,
nke a bụkwa iju eju nke mkpụrụ e ji wezuga mmehie ya:
Mgbe ha gweriri nkume niile ha ji wuo ebe ịchụ aja arụsị ha
dịka ntụ,
mgbe ha wezugara ogidi arụsị Ashera,
na ebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ niile. 10Obodo ahụ e wusiri ike adakpọsịala.
Ọ ghọọla ọzara nke ndị mmadụ na-ebighị nʼime ya.
Ọ ghọọkwala ebe ụmụ ehi na-akpa nri,
ebe ha na-amakpu na-ezu ike.
Ha ga-atacha ahịhịa dị nʼalaka osisi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.