Aịzaya 27:10
Isaiah 27:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Obodo ahụ e wusiri ike adakpọsịala. Ọ ghọọla ọzara nke ndị mmadụ na-ebighị nʼime ya. Ọ ghọọkwala ebe ụmụ ehi na-akpa nri, ebe ha na-amakpu na-ezu ike. Ha ga-atacha ahịhịa dị nʼalaka osisi.
Isaiah 27:10 in English
Isaiah 27:10 · Berean Standard Bible
For the fortified city lies deserted— a homestead abandoned, a wilderness forsaken. There the calves graze, and there they lie down; they strip its branches bare.
Context
8Onyenwe anyị tara ndị ya ahụhụ, mee ka a dọrọ ha nʼagha ma buru ha gaa mba ọzọ.
Ọ bụ ifufe ọjọọ nke si nʼọwụwa anyanwụ
ka o ji bupụ ha. 9Ọ bụ nʼụzọ dị otu a ka a ga-esi bupụ ikpe ọmụma dịrị Jekọb,
nke a bụkwa iju eju nke mkpụrụ e ji wezuga mmehie ya:
Mgbe ha gweriri nkume niile ha ji wuo ebe ịchụ aja arụsị ha
dịka ntụ,
mgbe ha wezugara ogidi arụsị Ashera,
na ebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ niile. 10Obodo ahụ e wusiri ike adakpọsịala.
Ọ ghọọla ọzara nke ndị mmadụ na-ebighị nʼime ya.
Ọ ghọọkwala ebe ụmụ ehi na-akpa nri,
ebe ha na-amakpu na-ezu ike.
Ha ga-atacha ahịhịa dị nʼalaka osisi. 11Mgbe alaka osisi ndị ahụ kpọnwụrụ daa,
ụmụ nwanyị ga-abịa chịkọtaa ha were ha kwanye ọkụ.
Nʼihi na ndị a bụ ndị na-enweghị nghọta.
Ọ bụ nke a mere Onye kere ha adịghị emere ha ebere.
Onye ahụ kpụrụ ha agakwaghị egosi ha obi ebere. 12Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-ahọcha site nʼebe mmiri na-eru eru Yufretis ruo na Wadi nke Ijipt, ma gị, bụ Izrel ka a ga-achịkọta otu nʼotu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.