Aịzaya 27:12
Isaiah 27:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-ahọcha site nʼebe mmiri na-eru eru Yufretis ruo na Wadi nke Ijipt, ma gị, bụ Izrel ka a ga-achịkọta otu nʼotu.
Isaiah 27:12 in English
Isaiah 27:12 · Berean Standard Bible
In that day the LORD will thresh from the flowing Euphrates * to the Wadi of Egypt, and you, O Israelites, will be gathered one by one.
Context
10Obodo ahụ e wusiri ike adakpọsịala.
Ọ ghọọla ọzara nke ndị mmadụ na-ebighị nʼime ya.
Ọ ghọọkwala ebe ụmụ ehi na-akpa nri,
ebe ha na-amakpu na-ezu ike.
Ha ga-atacha ahịhịa dị nʼalaka osisi. 11Mgbe alaka osisi ndị ahụ kpọnwụrụ daa,
ụmụ nwanyị ga-abịa chịkọtaa ha were ha kwanye ọkụ.
Nʼihi na ndị a bụ ndị na-enweghị nghọta.
Ọ bụ nke a mere Onye kere ha adịghị emere ha ebere.
Onye ahụ kpụrụ ha agakwaghị egosi ha obi ebere. 12Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-ahọcha site nʼebe mmiri na-eru eru Yufretis ruo na Wadi nke Ijipt, ma gị, bụ Izrel ka a ga-achịkọta otu nʼotu. 13Nʼụbọchị ahụ, opi ike ga-ada. Ndị ahụ na-ala nʼiyi nʼAsịrịa na ndị ahụ e mere ka ha gaa biri nʼIjipt dịka ndị mba ọzọ ga-abịa fee Onyenwe anyị ofufe nʼugwu nsọ ya dị na Jerusalem.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.