Aịzaya 27:13
Isaiah 27:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụbọchị ahụ, opi ike ga-ada. Ndị ahụ na-ala nʼiyi nʼAsịrịa na ndị ahụ e mere ka ha gaa biri nʼIjipt dịka ndị mba ọzọ ga-abịa fee Onyenwe anyị ofufe nʼugwu nsọ ya dị na Jerusalem.
Isaiah 27:13 in English
Isaiah 27:13 · Berean Standard Bible
And in that day a great ram’s horn will sound, and those who were perishing in Assyria will come forth with those who were exiles in Egypt. And they will worship the LORD on the holy mountain in Jerusalem.
Context
11Mgbe alaka osisi ndị ahụ kpọnwụrụ daa,
ụmụ nwanyị ga-abịa chịkọtaa ha were ha kwanye ọkụ.
Nʼihi na ndị a bụ ndị na-enweghị nghọta.
Ọ bụ nke a mere Onye kere ha adịghị emere ha ebere.
Onye ahụ kpụrụ ha agakwaghị egosi ha obi ebere. 12Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-ahọcha site nʼebe mmiri na-eru eru Yufretis ruo na Wadi nke Ijipt, ma gị, bụ Izrel ka a ga-achịkọta otu nʼotu. 13Nʼụbọchị ahụ, opi ike ga-ada. Ndị ahụ na-ala nʼiyi nʼAsịrịa na ndị ahụ e mere ka ha gaa biri nʼIjipt dịka ndị mba ọzọ ga-abịa fee Onyenwe anyị ofufe nʼugwu nsọ ya dị na Jerusalem.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.