Aịzaya 2:5
Isaiah 2:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu ụlọ Jekọb, bịanụ ka anyị na-agbaso ìhè nke Onyenwe anyị anyị.
Isaiah 2:5 in English
Isaiah 2:5 · Berean Standard Bible
Come, O house of Jacob, let us walk in the light of the LORD.
Context
3Ọtụtụ ndị mmadụ ga-abịa ma sịkwa,
“Bịanụ, ka anyị rigoruo ugwu Onyenwe anyị,
ka anyị gaa nʼụlọnsọ ukwu Chineke nke Jekọb.
Ọ ga-akụziri anyị ụzọ* ya niile,
ka anyị nwe ike jee ije nʼokporoụzọ ya niile.”*
Iwu ga-esi na Zayọn pụta,
okwu Onyenwe anyị ga-esitekwa na Jerusalem pụta.* 4Ọ ga-ekpe ikpe nʼetiti mba niile,
doziekwa esemokwu dị nʼetiti ndị dị iche iche.
Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha niile mee ka ha bụrụ mma oge;
kpụgharịkwa ùbe ha mee ya ka ọ ghọọ mma ịkwacha osisi.
Mba ọbụla agakwaghị ebuli mma agha megide mba ọzọ,
maọbụ zụọ onwe ha nʼịlụ agha ọzọ. 5Unu ụlọ Jekọb, bịanụ
ka anyị na-agbaso ìhè nke Onyenwe anyị anyị. 6Gị, bụ Onyenwe anyị, Ị gbakụtala ndị gị,
bụ ụlọ Jekọb azụ.
Nʼihi na ha jupụtara nʼikpere arụsị nke si nʼọwụwa anyanwụ.
Ha na-ajụkwa ase dịka ndị Filistia.
Ha na ndị na-ekpere arụsị na-ejikọkwa aka. 7Ala ha jupụtara nʼọlaọcha na ọlaedo,
ha bara ụba nke ukwuu.
Ala ha jupụtara nʼịnyịnya.
Ụgbọ agha ha dịkwa ukwuu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.