Aịzaya 2:3
Isaiah 2:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọtụtụ ndị mmadụ ga-abịa ma sịkwa, “Bịanụ, ka anyị rigoruo ugwu Onyenwe anyị, ka anyị gaa nʼụlọnsọ ukwu Chineke nke Jekọb. Ọ ga-akụziri anyị ụzọ* ya niile, ka anyị nwe ike jee ije nʼokporoụzọ ya niile.”* Iwu ga-esi na Zayọn pụta, okwu Onyenwe anyị ga-esitekwa na Jerusalem pụta.*
Isaiah 2:3 in English
Isaiah 2:3 · Berean Standard Bible
And many peoples will come and say: “Come, let us go up to the mountain of the LORD, to the house of the God of Jacob. He will teach us His ways so that we may walk in His paths.” For the law will go forth from Zion, and the word of the LORD from Jerusalem.
Context
1Nke a bụ ihe Aịzaya nwa Emọz hụrụ banyere Juda na Jerusalem. 2Nʼụbọchị ikpeazụ,
ugwu nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ga-abụ nke eguzobere
dịka ugwu dị elu karịa ugwu niile,
a ga-ebuli ya elu karịa ugwu nta niile,
mba niile dị iche iche ga-eruba nʼime ya dịka iyi. 3Ọtụtụ ndị mmadụ ga-abịa ma sịkwa,
“Bịanụ, ka anyị rigoruo ugwu Onyenwe anyị,
ka anyị gaa nʼụlọnsọ ukwu Chineke nke Jekọb.
Ọ ga-akụziri anyị ụzọ* ya niile,
ka anyị nwe ike jee ije nʼokporoụzọ ya niile.”*
Iwu ga-esi na Zayọn pụta,
okwu Onyenwe anyị ga-esitekwa na Jerusalem pụta.* 4Ọ ga-ekpe ikpe nʼetiti mba niile,
doziekwa esemokwu dị nʼetiti ndị dị iche iche.
Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha niile mee ka ha bụrụ mma oge;
kpụgharịkwa ùbe ha mee ya ka ọ ghọọ mma ịkwacha osisi.
Mba ọbụla agakwaghị ebuli mma agha megide mba ọzọ,
maọbụ zụọ onwe ha nʼịlụ agha ọzọ. 5Unu ụlọ Jekọb, bịanụ
ka anyị na-agbaso ìhè nke Onyenwe anyị anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.