Aịzaya 2:1
Isaiah 2:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke a bụ ihe Aịzaya nwa Emọz hụrụ banyere Juda na Jerusalem.
Isaiah 2:1 in English
Isaiah 2:1 · Berean Standard Bible
This is the message that was revealed to Isaiah son of Amoz concerning Judah and Jerusalem:
Context
1Nke a bụ ihe Aịzaya nwa Emọz hụrụ banyere Juda na Jerusalem. 2Nʼụbọchị ikpeazụ,
ugwu nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ga-abụ nke eguzobere
dịka ugwu dị elu karịa ugwu niile,
a ga-ebuli ya elu karịa ugwu nta niile,
mba niile dị iche iche ga-eruba nʼime ya dịka iyi. 3Ọtụtụ ndị mmadụ ga-abịa ma sịkwa,
“Bịanụ, ka anyị rigoruo ugwu Onyenwe anyị,
ka anyị gaa nʼụlọnsọ ukwu Chineke nke Jekọb.
Ọ ga-akụziri anyị ụzọ* ya niile,
ka anyị nwe ike jee ije nʼokporoụzọ ya niile.”*
Iwu ga-esi na Zayọn pụta,
okwu Onyenwe anyị ga-esitekwa na Jerusalem pụta.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.