Native Bible

Isaiah 2:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nke a bụ ihe Aịzaya nwa Emọz hụrụ banyere Juda na Jerusalem.

Isaiah 2:1 in English

Isaiah 2:1 · Berean Standard Bible

This is the message that was revealed to Isaiah son of Amoz concerning Judah and Jerusalem:

Context

1Nke a bụ ihe Aịzaya nwa Emọz hụrụ banyere Juda na Jerusalem. 2Nʼụbọchị ikpeazụ, ugwu nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ga-abụ nke eguzobere dịka ugwu dị elu karịa ugwu niile, a ga-ebuli ya elu karịa ugwu nta niile, mba niile dị iche iche ga-eruba nʼime ya dịka iyi. 3Ọtụtụ ndị mmadụ ga-abịa ma sịkwa, “Bịanụ, ka anyị rigoruo ugwu Onyenwe anyị, ka anyị gaa nʼụlọnsọ ukwu Chineke nke Jekọb. Ọ ga-akụziri anyị ụzọ* ya niile, ka anyị nwe ike jee ije nʼokporoụzọ ya niile.”* Iwu ga-esi na Zayọn pụta, okwu Onyenwe anyị ga-esitekwa na Jerusalem pụta.*

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.