Aịzaya 2:7
Isaiah 2:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ala ha jupụtara nʼọlaọcha na ọlaedo, ha bara ụba nke ukwuu. Ala ha jupụtara nʼịnyịnya. Ụgbọ agha ha dịkwa ukwuu.
Isaiah 2:7 in English
Isaiah 2:7 · Berean Standard Bible
Their land is full of silver and gold, with no limit to their treasures; their land is full of horses, with no limit to their chariots.
Context
5Unu ụlọ Jekọb, bịanụ
ka anyị na-agbaso ìhè nke Onyenwe anyị anyị. 6Gị, bụ Onyenwe anyị, Ị gbakụtala ndị gị,
bụ ụlọ Jekọb azụ.
Nʼihi na ha jupụtara nʼikpere arụsị nke si nʼọwụwa anyanwụ.
Ha na-ajụkwa ase dịka ndị Filistia.
Ha na ndị na-ekpere arụsị na-ejikọkwa aka. 7Ala ha jupụtara nʼọlaọcha na ọlaedo,
ha bara ụba nke ukwuu.
Ala ha jupụtara nʼịnyịnya.
Ụgbọ agha ha dịkwa ukwuu. 8Ala ha jupụtara nʼarụsị,
ha na-akpọ isiala nye ihe ndị ahụ ha ji aka ha kpụọ,
ihe ndị ahụ mkpịsịaka ha kpụrụ. 9Nʼihi ya, a ga-eme ka mmadụ bụrụ ihe e wedara nʼala,
meekwa ka mmadụ niile bụrụ ndị e wedara nʼala.
Ya mere, agbagharala ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.