Aịzaya 2:6
Isaiah 2:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gị, bụ Onyenwe anyị, Ị gbakụtala ndị gị, bụ ụlọ Jekọb azụ. Nʼihi na ha jupụtara nʼikpere arụsị nke si nʼọwụwa anyanwụ. Ha na-ajụkwa ase dịka ndị Filistia. Ha na ndị na-ekpere arụsị na-ejikọkwa aka.
Isaiah 2:6 in English
Isaiah 2:6 · Berean Standard Bible
For You have abandoned Your people, the house of Jacob, because they are filled with influences from the east; they are soothsayers like the Philistines; they strike hands with the children of foreigners.
Context
4Ọ ga-ekpe ikpe nʼetiti mba niile,
doziekwa esemokwu dị nʼetiti ndị dị iche iche.
Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha niile mee ka ha bụrụ mma oge;
kpụgharịkwa ùbe ha mee ya ka ọ ghọọ mma ịkwacha osisi.
Mba ọbụla agakwaghị ebuli mma agha megide mba ọzọ,
maọbụ zụọ onwe ha nʼịlụ agha ọzọ. 5Unu ụlọ Jekọb, bịanụ
ka anyị na-agbaso ìhè nke Onyenwe anyị anyị. 6Gị, bụ Onyenwe anyị, Ị gbakụtala ndị gị,
bụ ụlọ Jekọb azụ.
Nʼihi na ha jupụtara nʼikpere arụsị nke si nʼọwụwa anyanwụ.
Ha na-ajụkwa ase dịka ndị Filistia.
Ha na ndị na-ekpere arụsị na-ejikọkwa aka. 7Ala ha jupụtara nʼọlaọcha na ọlaedo,
ha bara ụba nke ukwuu.
Ala ha jupụtara nʼịnyịnya.
Ụgbọ agha ha dịkwa ukwuu. 8Ala ha jupụtara nʼarụsị,
ha na-akpọ isiala nye ihe ndị ahụ ha ji aka ha kpụọ,
ihe ndị ahụ mkpịsịaka ha kpụrụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.