Aịzaya 14:17
Isaiah 14:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ onye a bụ onye ahụ mebiri ụwa mee ya ka ọ dị ka ọzara? Ọ bụ ya tikpọrọ obodo ukwu ya niile, jụkwa ịhapụ ndị ọ dọtara nʼagha ka ha laa?”
Isaiah 14:17 in English
Isaiah 14:17 · Berean Standard Bible
who turned the world into a desert and destroyed its cities, who refused to let the captives return to their homes?”
Context
15Ma a ga-ewedata gị ala ruo nʼili,
ruo na nsọtụ ala mmụọ. 16Ndị niile hụrụ gị na-elegide gị anya,
na-atule banyere ndụ gị, sị,
“Ọ bụ nwoke a bụ onye ahụ mere ka ụwa maa jijiji,
onye mekwara ka alaeze mee mkpọtụ. 17Ọ bụ onye a bụ onye ahụ mebiri ụwa mee ya ka ọ dị ka ọzara?
Ọ bụ ya tikpọrọ obodo ukwu ya niile,
jụkwa ịhapụ ndị ọ dọtara nʼagha ka ha laa?” 18Ndị eze mba niile dị iche iche
na-edina na nsọpụrụ nʼime ili ha. 19Ma ozu gị ka a tụpụrụ
dịka alaka osisi rụrụ arụ, nke gbajiri agbaji.
Ọ bụkwa ozu ndị niile e gburu nʼagha,
na ozu ndị e ji mma agha mapuo afọ,
ndị na-arịdaru nʼolulu nkume, ka e ji kpuchie gị nʼili gị.
E, ozu gị dị ka ozu nke ịnyịnya zọtọrọ ụkwụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.