Native Bible

Isaiah 14:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma a ga-ewedata gị ala ruo nʼili, ruo na nsọtụ ala mmụọ.

Isaiah 14:15 in English

Isaiah 14:15 · Berean Standard Bible

But you will be brought down to Sheol, to the lowest depths of the Pit.

Context

13Nʼihi na i kwuru ya nʼobi gị sị, “Aga m arịgoro nʼeluigwe, doo ocheeze m nʼelu kpakpando niile Chineke kere; aga m anọdụkwa nʼugwu nzukọ, na nsọtụ ugwu nsọ ahụ dị nʼelu elu ugwu, tụọ iwu. 14Aga m arịgo nʼebe kachasị elu nke eluigwe, mee onwe m ka m dịrị ka Onye kachasị ihe niile elu.” 15Ma a ga-ewedata gị ala ruo nʼili, ruo na nsọtụ ala mmụọ. 16Ndị niile hụrụ gị na-elegide gị anya, na-atule banyere ndụ gị, sị, “Ọ bụ nwoke a bụ onye ahụ mere ka ụwa maa jijiji, onye mekwara ka alaeze mee mkpọtụ. 17Ọ bụ onye a bụ onye ahụ mebiri ụwa mee ya ka ọ dị ka ọzara? Ọ bụ ya tikpọrọ obodo ukwu ya niile, jụkwa ịhapụ ndị ọ dọtara nʼagha ka ha laa?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.