Aịzaya 14:16
Isaiah 14:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị niile hụrụ gị na-elegide gị anya, na-atule banyere ndụ gị, sị, “Ọ bụ nwoke a bụ onye ahụ mere ka ụwa maa jijiji, onye mekwara ka alaeze mee mkpọtụ.
Isaiah 14:16 in English
Isaiah 14:16 · Berean Standard Bible
Those who see you will stare; they will ponder your fate: “Is this the man who shook the earth and made the kingdoms tremble,
Context
14Aga m arịgo nʼebe kachasị elu nke eluigwe,
mee onwe m ka m dịrị ka Onye kachasị ihe niile elu.” 15Ma a ga-ewedata gị ala ruo nʼili,
ruo na nsọtụ ala mmụọ. 16Ndị niile hụrụ gị na-elegide gị anya,
na-atule banyere ndụ gị, sị,
“Ọ bụ nwoke a bụ onye ahụ mere ka ụwa maa jijiji,
onye mekwara ka alaeze mee mkpọtụ. 17Ọ bụ onye a bụ onye ahụ mebiri ụwa mee ya ka ọ dị ka ọzara?
Ọ bụ ya tikpọrọ obodo ukwu ya niile,
jụkwa ịhapụ ndị ọ dọtara nʼagha ka ha laa?” 18Ndị eze mba niile dị iche iche
na-edina na nsọpụrụ nʼime ili ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.