Aịzaya 14:13
Isaiah 14:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na i kwuru ya nʼobi gị sị, “Aga m arịgoro nʼeluigwe, doo ocheeze m nʼelu kpakpando niile Chineke kere; aga m anọdụkwa nʼugwu nzukọ, na nsọtụ ugwu nsọ ahụ dị nʼelu elu ugwu, tụọ iwu.
Isaiah 14:13 in English
Isaiah 14:13 · Berean Standard Bible
You said in your heart: “I will ascend to the heavens; I will raise my throne above the stars of God. I will sit on the mount of assembly, in the far reaches of the north.*
Context
11Nganga ịbụ eze gị niile, na oke ụzụ ụbọ akwara gị,
ka a na-elikọta nʼaja.
Ikpuru ga-aghọrọ anụ ahụ gị ebe ndina;
ọ bụkwa ikpuru ga-aghọ ihe mkpuchi ahụ gị. 12Lee ka i si site nʼeluigwe daa,
gị kpakpando ụtụtụ, nwa chi ọbụbọ.
Ọ bụ ezie na ị dị ukwuu nʼebe mba niile nke ụwa nọ na mbụ,
ma lee ka e si mee ka ị bụrụ onye a tụdara nʼala. 13Nʼihi na i kwuru ya nʼobi gị sị,
“Aga m arịgoro nʼeluigwe,
doo ocheeze m
nʼelu kpakpando niile Chineke kere;
aga m anọdụkwa nʼugwu nzukọ,
na nsọtụ ugwu nsọ ahụ dị nʼelu elu ugwu, tụọ iwu. 14Aga m arịgo nʼebe kachasị elu nke eluigwe,
mee onwe m ka m dịrị ka Onye kachasị ihe niile elu.” 15Ma a ga-ewedata gị ala ruo nʼili,
ruo na nsọtụ ala mmụọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.