Aịzaya 14:12
Isaiah 14:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lee ka i si site nʼeluigwe daa, gị kpakpando ụtụtụ, nwa chi ọbụbọ. Ọ bụ ezie na ị dị ukwuu nʼebe mba niile nke ụwa nọ na mbụ, ma lee ka e si mee ka ị bụrụ onye a tụdara nʼala.
Isaiah 14:12 in English
Isaiah 14:12 · Berean Standard Bible
How you have fallen from heaven, O day star,* son of the dawn! You have been cut down to the ground, O destroyer of nations.
Context
10Ha niile ga-eji otu olu zaa,
ha ga-asị gị,
“Gị onwe gị adịghịkwa ike, dịka anyị na-adịghị ike;
Ị ghọọla otu onye nʼime anyị.” 11Nganga ịbụ eze gị niile, na oke ụzụ ụbọ akwara gị,
ka a na-elikọta nʼaja.
Ikpuru ga-aghọrọ anụ ahụ gị ebe ndina;
ọ bụkwa ikpuru ga-aghọ ihe mkpuchi ahụ gị. 12Lee ka i si site nʼeluigwe daa,
gị kpakpando ụtụtụ, nwa chi ọbụbọ.
Ọ bụ ezie na ị dị ukwuu nʼebe mba niile nke ụwa nọ na mbụ,
ma lee ka e si mee ka ị bụrụ onye a tụdara nʼala. 13Nʼihi na i kwuru ya nʼobi gị sị,
“Aga m arịgoro nʼeluigwe,
doo ocheeze m
nʼelu kpakpando niile Chineke kere;
aga m anọdụkwa nʼugwu nzukọ,
na nsọtụ ugwu nsọ ahụ dị nʼelu elu ugwu, tụọ iwu. 14Aga m arịgo nʼebe kachasị elu nke eluigwe,
mee onwe m ka m dịrị ka Onye kachasị ihe niile elu.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.