Aịzaya 14:10
Isaiah 14:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha niile ga-eji otu olu zaa, ha ga-asị gị, “Gị onwe gị adịghịkwa ike, dịka anyị na-adịghị ike; Ị ghọọla otu onye nʼime anyị.”
Isaiah 14:10 in English
Isaiah 14:10 · Berean Standard Bible
They will all respond to you, saying, “You too have become weak, as we are; you have become like us!”
Context
8Ọ bụladị osisi junipa na osisi sida niile nke Lebanọn
na-aṅụrị ọṅụ megide gị na-asị,
“Agbajiela ike gị;
ugbu a ọ dịkwaghị onye ga-esogbu anyị ọzọ.” 9Ala mmụọ na-eme mkpọtụ,
na-eche izute gị nʼọbịbịa gị;
ọ na-akpọte mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ ịbịa kelee gị,
bụ ndị niile bụburịị ndị ndu nʼụwa,
ọ na-eme ka ha si nʼocheeze ha niile bilie
bụ ndị niile ahụ bụ eze na mba niile dị iche iche. 10Ha niile ga-eji otu olu zaa,
ha ga-asị gị,
“Gị onwe gị adịghịkwa ike, dịka anyị na-adịghị ike;
Ị ghọọla otu onye nʼime anyị.” 11Nganga ịbụ eze gị niile, na oke ụzụ ụbọ akwara gị,
ka a na-elikọta nʼaja.
Ikpuru ga-aghọrọ anụ ahụ gị ebe ndina;
ọ bụkwa ikpuru ga-aghọ ihe mkpuchi ahụ gị. 12Lee ka i si site nʼeluigwe daa,
gị kpakpando ụtụtụ, nwa chi ọbụbọ.
Ọ bụ ezie na ị dị ukwuu nʼebe mba niile nke ụwa nọ na mbụ,
ma lee ka e si mee ka ị bụrụ onye a tụdara nʼala.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.