Native Bible

Isaiah 14:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụladị osisi junipa na osisi sida niile nke Lebanọn na-aṅụrị ọṅụ megide gị na-asị, “Agbajiela ike gị; ugbu a ọ dịkwaghị onye ga-esogbu anyị ọzọ.”

Isaiah 14:8 in English

Isaiah 14:8 · Berean Standard Bible

Even the cypresses * and cedars of Lebanon exult over you: “Since you have been laid low, no woodcutter comes against us.”

Context

6nke sitere nʼiwe tidasịa ndị mmadụ na-esepụghị aka nʼiti ha ihe, nke ji nrubiga oke nke iwe ya megbuo mba dị iche iche ya na oke mmekpa ahụ na-enweghị nkwusi. 7Ụwa niile adaala jụ, ha enwekwaala izuike, ha na-etipụ olu ịbụ abụ. 8Ọ bụladị osisi junipa na osisi sida niile nke Lebanọn na-aṅụrị ọṅụ megide gị na-asị, “Agbajiela ike gị; ugbu a ọ dịkwaghị onye ga-esogbu anyị ọzọ.” 9Ala mmụọ na-eme mkpọtụ, na-eche izute gị nʼọbịbịa gị; ọ na-akpọte mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ ịbịa kelee gị, bụ ndị niile bụburịị ndị ndu nʼụwa, ọ na-eme ka ha si nʼocheeze ha niile bilie bụ ndị niile ahụ bụ eze na mba niile dị iche iche. 10Ha niile ga-eji otu olu zaa, ha ga-asị gị, “Gị onwe gị adịghịkwa ike, dịka anyị na-adịghị ike; Ị ghọọla otu onye nʼime anyị.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.