Aịzaya 14:6
Isaiah 14:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
nke sitere nʼiwe tidasịa ndị mmadụ na-esepụghị aka nʼiti ha ihe, nke ji nrubiga oke nke iwe ya megbuo mba dị iche iche ya na oke mmekpa ahụ na-enweghị nkwusi.
Isaiah 14:6 in English
Isaiah 14:6 · Berean Standard Bible
It struck the peoples in anger with unceasing blows; it subdued the nations in rage with relentless persecution.
Context
4unu ga-achị eze Babilọn ọchị sị ya, Leenụ gị.
Ahaa, lee ka i si daa gị onye na-emegbu ndị mmadụ.
Lee ka ịkpa ike gị si gwụsịa! 5Nʼihi na Onyenwe anyị anyajiela mkpara ndị na-eme ajọ ihe,
meekwa ka mkpara ndị na-achị achị, 6nke sitere nʼiwe tidasịa ndị mmadụ
na-esepụghị aka nʼiti ha ihe,
nke ji nrubiga oke nke iwe ya megbuo mba dị iche iche
ya na oke mmekpa ahụ na-enweghị nkwusi. 7Ụwa niile adaala jụ, ha enwekwaala izuike,
ha na-etipụ olu ịbụ abụ. 8Ọ bụladị osisi junipa na osisi sida niile nke Lebanọn
na-aṅụrị ọṅụ megide gị na-asị,
“Agbajiela ike gị;
ugbu a ọ dịkwaghị onye ga-esogbu anyị ọzọ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.