Aịzaya 14:19
Isaiah 14:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ozu gị ka a tụpụrụ dịka alaka osisi rụrụ arụ, nke gbajiri agbaji. Ọ bụkwa ozu ndị niile e gburu nʼagha, na ozu ndị e ji mma agha mapuo afọ, ndị na-arịdaru nʼolulu nkume, ka e ji kpuchie gị nʼili gị. E, ozu gị dị ka ozu nke ịnyịnya zọtọrọ ụkwụ.
Isaiah 14:19 in English
Isaiah 14:19 · Berean Standard Bible
But you are cast out of your grave like a rejected branch, covered by those slain with the sword, and dumped into a rocky pit like a carcass trampled underfoot.
Context
17Ọ bụ onye a bụ onye ahụ mebiri ụwa mee ya ka ọ dị ka ọzara?
Ọ bụ ya tikpọrọ obodo ukwu ya niile,
jụkwa ịhapụ ndị ọ dọtara nʼagha ka ha laa?” 18Ndị eze mba niile dị iche iche
na-edina na nsọpụrụ nʼime ili ha. 19Ma ozu gị ka a tụpụrụ
dịka alaka osisi rụrụ arụ, nke gbajiri agbaji.
Ọ bụkwa ozu ndị niile e gburu nʼagha,
na ozu ndị e ji mma agha mapuo afọ,
ndị na-arịdaru nʼolulu nkume, ka e ji kpuchie gị nʼili gị.
E, ozu gị dị ka ozu nke ịnyịnya zọtọrọ ụkwụ. 20A gaghị eli gị dịka e si lie ndị eze ndị ọzọ,
nʼihi na i bibiela ala gị.
I gbukwaala ndị gị.
A gaghị akpọtụkwa aha ụmụ ụmụ
ndị na-emebi iwu ọzọ. 21Dozienụ ebe a ga-anọ gbuo ụmụ ya ndị ikom,
nʼihi mmehie nke ndị bụ nna ha.
Ha agaghị ebili nweta ala ahụ,
mee ka elu ụwa jupụta nʼobodo ha niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.