Hosiya 9:12
Hosea 9:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A sịkwa na ha azụlite ụmụ ha, aghaghị m ime ka ha nwụọ. Ahụhụ ga-adịrị ha, mgbe m si nʼebe ha nọ wezuga onwe m.
Hosea 9:12 in English
Hosea 9:12 · Berean Standard Bible
Even if they raise their children, I will bereave them of each one. Yes, woe be to them when I turn away from them!
Context
10“Mgbe m chọtara Izrel,
ọ dị ka m chọtara mkpụrụ grepu nʼọzara;
mgbe m hụrụ nna nna unu ha,
ọ dị ka ihu mkpụrụ bụ ụzọ chaa nʼelu osisi fiig.
Ma mgbe ha bịaruru na Baal-Peoa,
ha doro onwe ha nsọ nyefee nʼaka arụsị ahụ na-eweta ihere,
si otu a ghọọ ndị rụrụ arụ, dịka ihe ndị ahụ ha hụrụ nʼanya si bụrụ ihe rụrụ arụ. 11Nsọpụrụ Ifrem nwere ga-efefu dị ka nnụnụ,
nʼihi na ọmụmụ nwa agaghị adị, a gaghị atụkwa ime, agaghị adịkwa ime. 12A sịkwa na ha azụlite ụmụ ha,
aghaghị m ime ka ha nwụọ.
Ahụhụ ga-adịrị ha,
mgbe m si nʼebe ha nọ wezuga onwe m. 13Ahụla m na Ifrem yiri Taịa,
bụ ihe akụnyere nʼala mara mma.
Ma Ifrem ga-eji aka ya
kpọpụta ụmụ ya nye ndị ga-egbu ha.” 14Biko, Onyenwe anyị nye ha.
Gịnị ka i kwesiri inye ha?
Nye ha akpanwa nke nwa na-adịghị anọgide nʼime ya,
na ara nke mmiri ara na-adịghị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.