Hosiya 9:13
Hosea 9:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ahụla m na Ifrem yiri Taịa, bụ ihe akụnyere nʼala mara mma. Ma Ifrem ga-eji aka ya kpọpụta ụmụ ya nye ndị ga-egbu ha.”
Hosea 9:13 in English
Hosea 9:13 · Berean Standard Bible
I have seen Ephraim, like Tyre, planted in a meadow. But Ephraim will bring out his children for slaughter.
Context
11Nsọpụrụ Ifrem nwere ga-efefu dị ka nnụnụ,
nʼihi na ọmụmụ nwa agaghị adị, a gaghị atụkwa ime, agaghị adịkwa ime. 12A sịkwa na ha azụlite ụmụ ha,
aghaghị m ime ka ha nwụọ.
Ahụhụ ga-adịrị ha,
mgbe m si nʼebe ha nọ wezuga onwe m. 13Ahụla m na Ifrem yiri Taịa,
bụ ihe akụnyere nʼala mara mma.
Ma Ifrem ga-eji aka ya
kpọpụta ụmụ ya nye ndị ga-egbu ha.” 14Biko, Onyenwe anyị nye ha.
Gịnị ka i kwesiri inye ha?
Nye ha akpanwa nke nwa na-adịghị anọgide nʼime ya,
na ara nke mmiri ara na-adịghị. 15“Ihe ọjọọ ha niile bidoro na Gilgal,
akpọrọ m ha asị nʼebe ahụ.
Nʼihi omume mmehie ha niile,
aghaghị m isite nʼụlọ m chụpụ ha.
Agaghị m ahụkwa ha nʼanya ọzọ,
ndị ndu ha niile bụ ndị nnupu isi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.