Hosiya 9:11
Hosea 9:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nsọpụrụ Ifrem nwere ga-efefu dị ka nnụnụ, nʼihi na ọmụmụ nwa agaghị adị, a gaghị atụkwa ime, agaghị adịkwa ime.
Hosea 9:11 in English
Hosea 9:11 · Berean Standard Bible
Ephraim’s glory will fly away like a bird, with no birth, no pregnancy, and no conception.
Context
9Ha emerụọla onwe ha ebe ọ dị ukwuu,
dịka ọ dị nʼụbọchị Gibea.
Ọ ga-echeta njehie ha.
Ọ ga-enye ha ntaramahụhụ nʼihi mmehie ha niile. 10“Mgbe m chọtara Izrel,
ọ dị ka m chọtara mkpụrụ grepu nʼọzara;
mgbe m hụrụ nna nna unu ha,
ọ dị ka ihu mkpụrụ bụ ụzọ chaa nʼelu osisi fiig.
Ma mgbe ha bịaruru na Baal-Peoa,
ha doro onwe ha nsọ nyefee nʼaka arụsị ahụ na-eweta ihere,
si otu a ghọọ ndị rụrụ arụ, dịka ihe ndị ahụ ha hụrụ nʼanya si bụrụ ihe rụrụ arụ. 11Nsọpụrụ Ifrem nwere ga-efefu dị ka nnụnụ,
nʼihi na ọmụmụ nwa agaghị adị, a gaghị atụkwa ime, agaghị adịkwa ime. 12A sịkwa na ha azụlite ụmụ ha,
aghaghị m ime ka ha nwụọ.
Ahụhụ ga-adịrị ha,
mgbe m si nʼebe ha nọ wezuga onwe m. 13Ahụla m na Ifrem yiri Taịa,
bụ ihe akụnyere nʼala mara mma.
Ma Ifrem ga-eji aka ya
kpọpụta ụmụ ya nye ndị ga-egbu ha.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.