Hosiya 9:14
Hosea 9:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Biko, Onyenwe anyị nye ha. Gịnị ka i kwesiri inye ha? Nye ha akpanwa nke nwa na-adịghị anọgide nʼime ya, na ara nke mmiri ara na-adịghị.
Hosea 9:14 in English
Hosea 9:14 · Berean Standard Bible
Give them, O LORD— what will You give? Give them wombs that miscarry and breasts that dry up!
Context
12A sịkwa na ha azụlite ụmụ ha,
aghaghị m ime ka ha nwụọ.
Ahụhụ ga-adịrị ha,
mgbe m si nʼebe ha nọ wezuga onwe m. 13Ahụla m na Ifrem yiri Taịa,
bụ ihe akụnyere nʼala mara mma.
Ma Ifrem ga-eji aka ya
kpọpụta ụmụ ya nye ndị ga-egbu ha.” 14Biko, Onyenwe anyị nye ha.
Gịnị ka i kwesiri inye ha?
Nye ha akpanwa nke nwa na-adịghị anọgide nʼime ya,
na ara nke mmiri ara na-adịghị. 15“Ihe ọjọọ ha niile bidoro na Gilgal,
akpọrọ m ha asị nʼebe ahụ.
Nʼihi omume mmehie ha niile,
aghaghị m isite nʼụlọ m chụpụ ha.
Agaghị m ahụkwa ha nʼanya ọzọ,
ndị ndu ha niile bụ ndị nnupu isi. 16Etigbuola Ifrem,
mgbọrọgwụ ha akpọnwụọla,
ha agaghị amịkwa mkpụrụ.
A sịkwarị na ha amụọ ụmụ,
aga m egbu ụmụ ha niile, ndị ha hụrụ nʼanya.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.