Hosiya 9:16
Hosea 9:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Etigbuola Ifrem, mgbọrọgwụ ha akpọnwụọla, ha agaghị amịkwa mkpụrụ. A sịkwarị na ha amụọ ụmụ, aga m egbu ụmụ ha niile, ndị ha hụrụ nʼanya.”
Hosea 9:16 in English
Hosea 9:16 · Berean Standard Bible
Ephraim is struck down; their root is withered; they cannot bear fruit. Even if they bear children, I will slay the darlings of their wombs.
Context
14Biko, Onyenwe anyị nye ha.
Gịnị ka i kwesiri inye ha?
Nye ha akpanwa nke nwa na-adịghị anọgide nʼime ya,
na ara nke mmiri ara na-adịghị. 15“Ihe ọjọọ ha niile bidoro na Gilgal,
akpọrọ m ha asị nʼebe ahụ.
Nʼihi omume mmehie ha niile,
aghaghị m isite nʼụlọ m chụpụ ha.
Agaghị m ahụkwa ha nʼanya ọzọ,
ndị ndu ha niile bụ ndị nnupu isi. 16Etigbuola Ifrem,
mgbọrọgwụ ha akpọnwụọla,
ha agaghị amịkwa mkpụrụ.
A sịkwarị na ha amụọ ụmụ,
aga m egbu ụmụ ha niile, ndị ha hụrụ nʼanya.” 17Chineke m ga-ajụ ha,
nʼihi na ha adịghị ege ya ntị maọbụ rube isi.
Ha ga-aghọ ndị na-awagharị awagharị na-enweghị ụlọ, nʼetiti mba niile.
9:7 Maọbụ, nleta
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.