Native Bible

Hosea 9:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ihe ọjọọ ha niile bidoro na Gilgal, akpọrọ m ha asị nʼebe ahụ. Nʼihi omume mmehie ha niile, aghaghị m isite nʼụlọ m chụpụ ha. Agaghị m ahụkwa ha nʼanya ọzọ, ndị ndu ha niile bụ ndị nnupu isi.

Hosea 9:15 in English

Hosea 9:15 · Berean Standard Bible

All their evil appears at Gilgal, for there I hated them. I will drive them from My house for the wickedness of their deeds. I will no longer love them; all their leaders are rebellious.

Context

13Ahụla m na Ifrem yiri Taịa, bụ ihe akụnyere nʼala mara mma. Ma Ifrem ga-eji aka ya kpọpụta ụmụ ya nye ndị ga-egbu ha.” 14Biko, Onyenwe anyị nye ha. Gịnị ka i kwesiri inye ha? Nye ha akpanwa nke nwa na-adịghị anọgide nʼime ya, na ara nke mmiri ara na-adịghị. 15“Ihe ọjọọ ha niile bidoro na Gilgal, akpọrọ m ha asị nʼebe ahụ. Nʼihi omume mmehie ha niile, aghaghị m isite nʼụlọ m chụpụ ha. Agaghị m ahụkwa ha nʼanya ọzọ, ndị ndu ha niile bụ ndị nnupu isi. 16Etigbuola Ifrem, mgbọrọgwụ ha akpọnwụọla, ha agaghị amịkwa mkpụrụ. A sịkwarị na ha amụọ ụmụ, aga m egbu ụmụ ha niile, ndị ha hụrụ nʼanya.” 17Chineke m ga-ajụ ha, nʼihi na ha adịghị ege ya ntị maọbụ rube isi. Ha ga-aghọ ndị na-awagharị awagharị na-enweghị ụlọ, nʼetiti mba niile. 9:7 Maọbụ, nleta

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.