Hosiya 9:15
Hosea 9:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ihe ọjọọ ha niile bidoro na Gilgal, akpọrọ m ha asị nʼebe ahụ. Nʼihi omume mmehie ha niile, aghaghị m isite nʼụlọ m chụpụ ha. Agaghị m ahụkwa ha nʼanya ọzọ, ndị ndu ha niile bụ ndị nnupu isi.
Hosea 9:15 in English
Hosea 9:15 · Berean Standard Bible
All their evil appears at Gilgal, for there I hated them. I will drive them from My house for the wickedness of their deeds. I will no longer love them; all their leaders are rebellious.
Context
13Ahụla m na Ifrem yiri Taịa,
bụ ihe akụnyere nʼala mara mma.
Ma Ifrem ga-eji aka ya
kpọpụta ụmụ ya nye ndị ga-egbu ha.” 14Biko, Onyenwe anyị nye ha.
Gịnị ka i kwesiri inye ha?
Nye ha akpanwa nke nwa na-adịghị anọgide nʼime ya,
na ara nke mmiri ara na-adịghị. 15“Ihe ọjọọ ha niile bidoro na Gilgal,
akpọrọ m ha asị nʼebe ahụ.
Nʼihi omume mmehie ha niile,
aghaghị m isite nʼụlọ m chụpụ ha.
Agaghị m ahụkwa ha nʼanya ọzọ,
ndị ndu ha niile bụ ndị nnupu isi. 16Etigbuola Ifrem,
mgbọrọgwụ ha akpọnwụọla,
ha agaghị amịkwa mkpụrụ.
A sịkwarị na ha amụọ ụmụ,
aga m egbu ụmụ ha niile, ndị ha hụrụ nʼanya.” 17Chineke m ga-ajụ ha,
nʼihi na ha adịghị ege ya ntị maọbụ rube isi.
Ha ga-aghọ ndị na-awagharị awagharị na-enweghị ụlọ, nʼetiti mba niile.
9:7 Maọbụ, nleta
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.