Hosiya 10:7
Hosea 10:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A ga-ala eze Sameria nʼiyi dịka irighiri osisi nʼelu mmiri niile,
Hosea 10:7 in English
Hosea 10:7 · Berean Standard Bible
Samaria will be carried off with her king like a twig on the surface of the water.
Context
5Ndị bi na Sameria ga-atụ ụjọ
nʼihi chi nke nwa ehi a kpụrụ akpụ dị na Bet-Aven.*
Ndị ya ga-eruru ya ụjụ,
otu a kwa ka ndị nchụaja ya
rụrụ arụ ga-esi ruoru ya ụjụ,
maka ebube nke a napụrụ ya. 6Ha ga-eburu ha gaa Asịrịa,
dịka onyinye ịnata ihuọma a ga-enye eze ukwu ahụ.
A ga-emenye Ifrem ihere nʼihu,
Izrel ga-ekpudokwa ihu nʼala maka mmekọrịta ya na ndị mba ọzọ. 7A ga-ala eze Sameria nʼiyi
dịka irighiri osisi nʼelu mmiri niile, 8a ga-ebibicha ebe niile dị elu nke ihe ọjọọ, bụ Aven,*
ọ bụ ya bụ mmehie ndị Izrel,
ogwu na uke ga-etolitekwa,
nʼebe nchụaja ha.
Mgbe ahụ ha ga-asị, ugwu ukwu niile, “Kpuchite anyị!”
Sịkwa ugwu nta niile, “Dakwasị anyị!” 9“Site nʼụbọchị nke Gibea, gị Izrel nọ na mmehie,
i nwebeghị ike site na mmehie ndị a wezuga onwe gị.
Ọ bụ na agha agaghị eri ha
bụ ndị na-eme ajọọ omume na Gibea?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.