Native Bible

Hosea 10:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

A ga-ala eze Sameria nʼiyi dịka irighiri osisi nʼelu mmiri niile,

Hosea 10:7 in English

Hosea 10:7 · Berean Standard Bible

Samaria will be carried off with her king like a twig on the surface of the water.

Context

5Ndị bi na Sameria ga-atụ ụjọ nʼihi chi nke nwa ehi a kpụrụ akpụ dị na Bet-Aven.* Ndị ya ga-eruru ya ụjụ, otu a kwa ka ndị nchụaja ya rụrụ arụ ga-esi ruoru ya ụjụ, maka ebube nke a napụrụ ya. 6Ha ga-eburu ha gaa Asịrịa, dịka onyinye ịnata ihuọma a ga-enye eze ukwu ahụ. A ga-emenye Ifrem ihere nʼihu, Izrel ga-ekpudokwa ihu nʼala maka mmekọrịta ya na ndị mba ọzọ. 7A ga-ala eze Sameria nʼiyi dịka irighiri osisi nʼelu mmiri niile, 8a ga-ebibicha ebe niile dị elu nke ihe ọjọọ, bụ Aven,* ọ bụ ya bụ mmehie ndị Izrel, ogwu na uke ga-etolitekwa, nʼebe nchụaja ha. Mgbe ahụ ha ga-asị, ugwu ukwu niile, “Kpuchite anyị!” Sịkwa ugwu nta niile, “Dakwasị anyị!” 9“Site nʼụbọchị nke Gibea, gị Izrel nọ na mmehie, i nwebeghị ike site na mmehie ndị a wezuga onwe gị. Ọ bụ na agha agaghị eri ha bụ ndị na-eme ajọọ omume na Gibea?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.