Hosiya 10:5
Hosea 10:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị bi na Sameria ga-atụ ụjọ nʼihi chi nke nwa ehi a kpụrụ akpụ dị na Bet-Aven.* Ndị ya ga-eruru ya ụjụ, otu a kwa ka ndị nchụaja ya rụrụ arụ ga-esi ruoru ya ụjụ, maka ebube nke a napụrụ ya.
Hosea 10:5 in English
Hosea 10:5 · Berean Standard Bible
The people of Samaria will fear for the calf of Beth-aven.* Indeed, its people will mourn with its idolatrous priests— those who rejoiced in its glory— for it has been taken from them into exile.
Context
3Ma ugbu a, ha ga-asị,
“Anyị enweghị eze,
nʼihi na anyị anaghị atụ Onyenwe anyị egwu,
ma olee ihe eze nwere ike ị mere anyị?” 4Ha na-ekwu okwu na-abaghị uru,
were ịṅụ iyi
na-agbakwa ndụ,
ya mere ikpe ikpe jiri jupụta nʼebe niile,
dịka ahịhịa ọjọọ nʼubi. 5Ndị bi na Sameria ga-atụ ụjọ
nʼihi chi nke nwa ehi a kpụrụ akpụ dị na Bet-Aven.*
Ndị ya ga-eruru ya ụjụ,
otu a kwa ka ndị nchụaja ya
rụrụ arụ ga-esi ruoru ya ụjụ,
maka ebube nke a napụrụ ya. 6Ha ga-eburu ha gaa Asịrịa,
dịka onyinye ịnata ihuọma a ga-enye eze ukwu ahụ.
A ga-emenye Ifrem ihere nʼihu,
Izrel ga-ekpudokwa ihu nʼala maka mmekọrịta ya na ndị mba ọzọ. 7A ga-ala eze Sameria nʼiyi
dịka irighiri osisi nʼelu mmiri niile,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.