Native Bible

Hosea 10:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha na-ekwu okwu na-abaghị uru, were ịṅụ iyi na-agbakwa ndụ, ya mere ikpe ikpe jiri jupụta nʼebe niile, dịka ahịhịa ọjọọ nʼubi.

Hosea 10:4 in English

Hosea 10:4 · Berean Standard Bible

They speak mere words; with false oaths they make covenants. So judgment springs up like poisonous weeds in the furrows of a field.

Context

2Obi ha dị aghụghọ, ma ugbu a, ha ga-ata ahụhụ maka ikpe ọmụma ha. Onyenwe anyị ga-akwatu ebe nchụaja ha, ma mebikwaa ogidi nkume nsọ ha niile. 3Ma ugbu a, ha ga-asị, “Anyị enweghị eze, nʼihi na anyị anaghị atụ Onyenwe anyị egwu, ma olee ihe eze nwere ike ị mere anyị?” 4Ha na-ekwu okwu na-abaghị uru, were ịṅụ iyi na-agbakwa ndụ, ya mere ikpe ikpe jiri jupụta nʼebe niile, dịka ahịhịa ọjọọ nʼubi. 5Ndị bi na Sameria ga-atụ ụjọ nʼihi chi nke nwa ehi a kpụrụ akpụ dị na Bet-Aven.* Ndị ya ga-eruru ya ụjụ, otu a kwa ka ndị nchụaja ya rụrụ arụ ga-esi ruoru ya ụjụ, maka ebube nke a napụrụ ya. 6Ha ga-eburu ha gaa Asịrịa, dịka onyinye ịnata ihuọma a ga-enye eze ukwu ahụ. A ga-emenye Ifrem ihere nʼihu, Izrel ga-ekpudokwa ihu nʼala maka mmekọrịta ya na ndị mba ọzọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.