Hosiya 10:4
Hosea 10:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha na-ekwu okwu na-abaghị uru, were ịṅụ iyi na-agbakwa ndụ, ya mere ikpe ikpe jiri jupụta nʼebe niile, dịka ahịhịa ọjọọ nʼubi.
Hosea 10:4 in English
Hosea 10:4 · Berean Standard Bible
They speak mere words; with false oaths they make covenants. So judgment springs up like poisonous weeds in the furrows of a field.
Context
2Obi ha dị aghụghọ,
ma ugbu a, ha ga-ata ahụhụ maka ikpe ọmụma ha.
Onyenwe anyị ga-akwatu ebe nchụaja ha,
ma mebikwaa ogidi nkume nsọ ha niile. 3Ma ugbu a, ha ga-asị,
“Anyị enweghị eze,
nʼihi na anyị anaghị atụ Onyenwe anyị egwu,
ma olee ihe eze nwere ike ị mere anyị?” 4Ha na-ekwu okwu na-abaghị uru,
were ịṅụ iyi
na-agbakwa ndụ,
ya mere ikpe ikpe jiri jupụta nʼebe niile,
dịka ahịhịa ọjọọ nʼubi. 5Ndị bi na Sameria ga-atụ ụjọ
nʼihi chi nke nwa ehi a kpụrụ akpụ dị na Bet-Aven.*
Ndị ya ga-eruru ya ụjụ,
otu a kwa ka ndị nchụaja ya
rụrụ arụ ga-esi ruoru ya ụjụ,
maka ebube nke a napụrụ ya. 6Ha ga-eburu ha gaa Asịrịa,
dịka onyinye ịnata ihuọma a ga-enye eze ukwu ahụ.
A ga-emenye Ifrem ihere nʼihu,
Izrel ga-ekpudokwa ihu nʼala maka mmekọrịta ya na ndị mba ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.