Native Bible

Hosea 10:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Obi ha dị aghụghọ, ma ugbu a, ha ga-ata ahụhụ maka ikpe ọmụma ha. Onyenwe anyị ga-akwatu ebe nchụaja ha, ma mebikwaa ogidi nkume nsọ ha niile.

Hosea 10:2 in English

Hosea 10:2 · Berean Standard Bible

Their hearts are devious; now they must bear their guilt. The LORD will break down their altars and demolish their sacred pillars.

Context

1Izrel bụ osisi vaịnị dị mma, nke na-amịta mkpụrụ nke ukwuu. Dịka mkpụrụ ya na-aba ụba, otu a ka o si amụba ebe ịchụ aja ya. Dịka ala ya na-abawanyekwa ụba otu a ka o si edoziri onwe ya nkume dị nsọ. 2Obi ha dị aghụghọ, ma ugbu a, ha ga-ata ahụhụ maka ikpe ọmụma ha. Onyenwe anyị ga-akwatu ebe nchụaja ha, ma mebikwaa ogidi nkume nsọ ha niile. 3Ma ugbu a, ha ga-asị, “Anyị enweghị eze, nʼihi na anyị anaghị atụ Onyenwe anyị egwu, ma olee ihe eze nwere ike ị mere anyị?” 4Ha na-ekwu okwu na-abaghị uru, were ịṅụ iyi na-agbakwa ndụ, ya mere ikpe ikpe jiri jupụta nʼebe niile, dịka ahịhịa ọjọọ nʼubi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.