Hosiya 10:2
Hosea 10:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Obi ha dị aghụghọ, ma ugbu a, ha ga-ata ahụhụ maka ikpe ọmụma ha. Onyenwe anyị ga-akwatu ebe nchụaja ha, ma mebikwaa ogidi nkume nsọ ha niile.
Hosea 10:2 in English
Hosea 10:2 · Berean Standard Bible
Their hearts are devious; now they must bear their guilt. The LORD will break down their altars and demolish their sacred pillars.
Context
1Izrel bụ osisi vaịnị dị mma,
nke na-amịta mkpụrụ nke ukwuu.
Dịka mkpụrụ ya na-aba ụba,
otu a ka o si amụba ebe ịchụ aja ya.
Dịka ala ya na-abawanyekwa ụba
otu a ka o si edoziri onwe ya nkume dị nsọ. 2Obi ha dị aghụghọ,
ma ugbu a, ha ga-ata ahụhụ maka ikpe ọmụma ha.
Onyenwe anyị ga-akwatu ebe nchụaja ha,
ma mebikwaa ogidi nkume nsọ ha niile. 3Ma ugbu a, ha ga-asị,
“Anyị enweghị eze,
nʼihi na anyị anaghị atụ Onyenwe anyị egwu,
ma olee ihe eze nwere ike ị mere anyị?” 4Ha na-ekwu okwu na-abaghị uru,
were ịṅụ iyi
na-agbakwa ndụ,
ya mere ikpe ikpe jiri jupụta nʼebe niile,
dịka ahịhịa ọjọọ nʼubi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.