Hosiya 10:1
Hosea 10:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Izrel bụ osisi vaịnị dị mma, nke na-amịta mkpụrụ nke ukwuu. Dịka mkpụrụ ya na-aba ụba, otu a ka o si amụba ebe ịchụ aja ya. Dịka ala ya na-abawanyekwa ụba otu a ka o si edoziri onwe ya nkume dị nsọ.
Hosea 10:1 in English
Hosea 10:1 · Berean Standard Bible
Israel was a luxuriant vine, yielding fruit for himself. The more his fruit increased, the more he increased the altars. The better his land produced, the better he made the sacred pillars.
Context
1Izrel bụ osisi vaịnị dị mma,
nke na-amịta mkpụrụ nke ukwuu.
Dịka mkpụrụ ya na-aba ụba,
otu a ka o si amụba ebe ịchụ aja ya.
Dịka ala ya na-abawanyekwa ụba
otu a ka o si edoziri onwe ya nkume dị nsọ. 2Obi ha dị aghụghọ,
ma ugbu a, ha ga-ata ahụhụ maka ikpe ọmụma ha.
Onyenwe anyị ga-akwatu ebe nchụaja ha,
ma mebikwaa ogidi nkume nsọ ha niile. 3Ma ugbu a, ha ga-asị,
“Anyị enweghị eze,
nʼihi na anyị anaghị atụ Onyenwe anyị egwu,
ma olee ihe eze nwere ike ị mere anyị?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.